Wednesday, August 22, 2012

ALA ANYI MBU NGWA

Kenania mbu otu amaraumunna ke nde Ngwa. Ala Ngwa mbu otu aburu nhiri nne la ala Igbo - Naijeria (Nigeria) Ngwa nmutara umu ato; UKWU, OHA la AVOSI. Ukwu mbu ya mbu opara Ngwa, nne nji ya la Oha. Avosi mbukwanu opara nwanyi ke nmere ya osota opara Ngwa.  Ala Ngwa nwere ala hienne. Ala Ngwa nwere iri l'ihi la ala anyi nji eme whe akoro mobu akuru l'oru eruo nne. Ala Anyi mbu Ngwa, otutu whe di iche iche di l'ime ya dika ; Nkwu, Aki, Oji la whe ndi odo. Ngwa nwere kansul ochichi obodo asaa la Steti Abia; Isiala Ngwa North, Isiala Ngwa South, Obingwa, Osisioma Ngwa, Ugwunagbo, Aba South la Aba North. Omelala Ngwa abughi whe madu nji ese abiri. Okwu Ngwa nfuru iche. Nde Ngwa abia burukwa ndi nwere mgbali ndi iche iche. Ala Ngwa nji eche ndi obia. Nde Ngwa nji abukwanu "ohuru obia gbawa nkwa"