Friday, August 1, 2014

OTU AMARAỤMỤNNA NGWA GBURUGBURU NGA IGBA AFỌ LA ABỤ

Otu amaraụmụnna anyị mbụ NGWA GBURUGBURU ke amụrụ l'abalị iteghite l'ọnwa asatọ ke afọ puku abụọ la iri la abụ. Ya mbụ la anyị nga ịgba afọ l'abụ l'abalị iteghite ke ọnwanania. Ya gazie!

ANYỊ NGAJE AGAJE

Ụmụnne, kenanịa mbụ ichetara anyị la anyị ngajedị nmenme nwanne anyị nwanyị Kasarachi la 17/08/14. Ozitara anyị ozi ọkpụkpọ oku ịbịa nọnyere ya. "Gbakụ gbakụ hie la madụ fere la nmụọ; madụ ejigh agbakụ onye iro ya" "Ririri mbụnụ ugwu eze" BỊANỤ TA ANYỊ NGARA YA NMENME.
Anyị ndị ịrịa onye Ngwa Gburugburu ọbụla ta onyetụ anyị whe onwere ike inye ta anyị ngwere tiya aka gaa zaa oku a. NGWA GBURUGBURU mbụ AMARAỤMỤNNA
Onye mbịatanụ chetakwa itiri nweyi yala imara nkpuru Ngwa Gburugburu. Ma inweghị ya ga agbalịa lee otu ịga iji ga ta gara Nwaada Obioma Onwubiko nda ntị. Yama nkpuru nagara fọrọ. Onye l'adịkwanụghị nda, iziekwa anyị ozi ekele, manyịm ngakwa iso gh.
Ehi ke gh otia!

OKWU NGWA NDỊ ỤTỌ EZIMARA

...onye nkara la okwu bekee nka ke Ngwa ụtọ?

Thursday, June 13, 2013

OLILI DEEDE (ELDER) INNOCENT O. ERUBA



Olili nde NGWA GBURUGBURU  ngara la abalị atọ la chọọchị ya, 12 / 06 / 2013 Ọ bụkwanụ olili Deede Elder INNOCENT O. ERUBA  opara nne BARR. L.T.C Eruba dimkpa asaa ke nde Ngwa gburugburu.
Ọdịkwaranụ la whe ya ke dịkwanụ la  Umuokahia Aba l'ụzọ ke ochie ngawara Umuahia m'ọbụ ụzọ Ururuka. Nde UGWUMBA CULTURAL MASTERS ke onye ishi we mbu Deede Ugochukwu Ugwuzor nkụrụ nkwa kụtakwa ọnụ ya. Ọtụtụ nde amara ahawe nmbịakwara  olilia  ndewe ndịka Senator Enyinnaya Abaribe, Hon. Uzo Azubuike, Chief David Chigbu.

Sunday, May 12, 2013

ỤWAEZUOKE - Kelechi Amucha

Nma dị nkọ adịị ishi, ke ndị ishi adịị nkọ. Ọdịị whe ngwụrụ madụ ike ọrụ mọbụkwanụ daa onyeahụ umengwụ dịka ngwọrụ ọjọọ. Okomadụ nwanyị nwere onye nlewa ya nka nsị l’abụrụwe nnwe nka. Ọdịịnụgh nma Elele nda agba ọdọ, ọgọdọ ya ada agba ọdọ. Onye ishinkwọcha adịị nma ịga ọgụ ejinụ ishi alụ. Nwanyị ọjọọ mọbụkwa nwoko ọjọọ mbụ agba ekperechi. 

Omere nwoko ncheta obi awịya lafọ mọbụkwanụ ikowa nwanyị obi l’elu l’ụtụtụ, ikoto lakwa l’abalị, wheawo mbụchaa aka ọrụ ịlụta nwanyị mọbụ nwoko ọjọọ. Amaralam lọdịị nwoko ndị nsọ yala nwanyị mbụ onye mụọ ozi, amakwaralam la Ụwaezuoke, ma arịrịom mbụ onye lile nwụrụ nwankịta ya nwụnye l’akpa. Nwoko mbịara kwụọ ụgwọ ishi gi abụghụ eghu mọbụkwanụ nwanyi nkwere gị di abụghụ ohu. 

Nwanyị ọjọọ mbụ ọrịa afọ. Ịlụta ya yebido nsogbu, ojighi akwụshị ọgwụla ma ogburugh mọbụkwanụ gwọfụ ya. Nwoko ọjọọ mbụkwa ikere mbere nṅaa ọjọọ, adịghị eji ike egbu ya. 

Alụm dilanwunye ndịkwanụ ụtọ ma nghọta dihala lagbata nwoko la nwanyị ya. Ọghakishiala, oji enye nsogbu la nkwuchikalata. Ụwaezuoke. 

Monday, December 17, 2012

TA ANYI NCHETAKWA NDE L'ODIGHI OTU OFOROLA WE L'EKERESHIMESI NANIA (Nneoma Chidi Onwudiwe)


Ụmụnnem, unu anọọ la yeh? A da'akwadola ekeresimesi! Ụbọchị eji echeta ọmụmụ onye nzọpụta anyi Jisos Krist. Aha Ya ọdọ nbụkwa Emmanuel. ( Onyenweanyi nọnyere anyi)

Ekperem l'ishi anyịalile mbụ ahụ ike, ọgalihu, nghọta, la ogologo ndu. Adikwam ịrọ udo l'etiti anyi la ikwu l'ibe anyi, ọgalihu la ọgbakọ Ngwa Gbururu na. Ma ada sịị ta Onye eligwe nọọnyere anyi l'njem l'ile anyi ngị mee la oge meemee na anyi nọọ l'ime ya. Adim ikpuchi anyi l'ọbara Jisos. Onye iro agaghi icheta anyi. Ọkporo nzọ ngi gara anyi werewere. Ụgwụ ọjọọ agaghi ịkpọ anyi. Onye nsọ ngị iburu anyi ụzọ ma kpekwara anyi azụ. Whe l'ile aka anyi'metụrụ gasịkwa ịga l'ihi. Chileke nara ekpere anyi ma gọziekwa ya l'aha Jisọs Krist bu onye nwe anyi, Amin.

Biniko, ta anyi nchetakwa ndi l'ọdighi otu ọfọrọ we. Onye ahadila nwanne ya.

Sunday, December 9, 2012

NTOKO ONWUMAFU, NTOKO ONWU MAFU ( onye ndere ya mbu; Magnus Chinemerem David)

Ese bu nkwa Nde Ngwa l'eji eku ma ''Onye Dimkpa'' nnwuo. Mgba nnannam ( Dick Dinneya) ndiira ndu ; o gwara m si ''Nwanwa m! Ese nkwuwalaghi ,d'ege ''nem-nem''(rythm) ya. O nofughi odo, otu dimkpa l'ala anyi anwuo, ekuo ''ese'' e ji eme ''okwukwu''( Unu amaala nu hwe m kagha) ya. Mgb' Opara dimkpa ya npuura ''eghu isi l'ama'' ya futa ,y'agba nkwa gahia nna l'ile(everywhere), gbawa jaa wuo ukwu l'ese. Whe mgbagwojurum anya mbu , la mgbe owuchara ukwu l'ese, kachaa wh'ike yara nna ya nmere; ndi ese akusuo nkwa odo. Unu amaala whe nkwaa ndagha '' ntoko onwu mafu.. ntoko onwumafu''. M'agbawa j'ajuo nnanna m whe kaa nfutara ya asi m l' obu kwa whe yara whe nkwu.

Whe Mmuta: O dighi otu eji dowa onu kpoo ''Owo'' onu l'agaghi ikafu akafu. Wh'ike la Wh'ike nji akwu. Uwa bu whe onye nkuru l'o g' ighoro. Juonu Nna anyi Polu la Ndi Galeshia 6:7 . Onye eligwe nkakwara ya la akwukwo Luku 6:38. Ndi k'anyi! anyi mmagharianu uro shigharia ishi. Onye ji mma (cutlass) gboto ya; t'anyi mgbawa nkwa. ''Kama onye mara ya nnyagha oku nnyaka m; m'adabalagha ya oku'' ; o bu okwu oma? I hakwaraghi ya oku kaa ,jee kwanwuo odo? I maala whe echi nwere ike i bu? A si m ''Onwa ohuu na mara anyi a l'ile nma ooooooo'' Amin!