Monday, December 17, 2012

TA ANYI NCHETAKWA NDE L'ODIGHI OTU OFOROLA WE L'EKERESHIMESI NANIA (Nneoma Chidi Onwudiwe)


Ụmụnnem, unu anọọ la yeh? A da'akwadola ekeresimesi! Ụbọchị eji echeta ọmụmụ onye nzọpụta anyi Jisos Krist. Aha Ya ọdọ nbụkwa Emmanuel. ( Onyenweanyi nọnyere anyi)

Ekperem l'ishi anyịalile mbụ ahụ ike, ọgalihu, nghọta, la ogologo ndu. Adikwam ịrọ udo l'etiti anyi la ikwu l'ibe anyi, ọgalihu la ọgbakọ Ngwa Gbururu na. Ma ada sịị ta Onye eligwe nọọnyere anyi l'njem l'ile anyi ngị mee la oge meemee na anyi nọọ l'ime ya. Adim ikpuchi anyi l'ọbara Jisos. Onye iro agaghi icheta anyi. Ọkporo nzọ ngi gara anyi werewere. Ụgwụ ọjọọ agaghi ịkpọ anyi. Onye nsọ ngị iburu anyi ụzọ ma kpekwara anyi azụ. Whe l'ile aka anyi'metụrụ gasịkwa ịga l'ihi. Chileke nara ekpere anyi ma gọziekwa ya l'aha Jisọs Krist bu onye nwe anyi, Amin.

Biniko, ta anyi nchetakwa ndi l'ọdighi otu ọfọrọ we. Onye ahadila nwanne ya.

Sunday, December 9, 2012

NTOKO ONWUMAFU, NTOKO ONWU MAFU ( onye ndere ya mbu; Magnus Chinemerem David)

Ese bu nkwa Nde Ngwa l'eji eku ma ''Onye Dimkpa'' nnwuo. Mgba nnannam ( Dick Dinneya) ndiira ndu ; o gwara m si ''Nwanwa m! Ese nkwuwalaghi ,d'ege ''nem-nem''(rythm) ya. O nofughi odo, otu dimkpa l'ala anyi anwuo, ekuo ''ese'' e ji eme ''okwukwu''( Unu amaala nu hwe m kagha) ya. Mgb' Opara dimkpa ya npuura ''eghu isi l'ama'' ya futa ,y'agba nkwa gahia nna l'ile(everywhere), gbawa jaa wuo ukwu l'ese. Whe mgbagwojurum anya mbu , la mgbe owuchara ukwu l'ese, kachaa wh'ike yara nna ya nmere; ndi ese akusuo nkwa odo. Unu amaala whe nkwaa ndagha '' ntoko onwu mafu.. ntoko onwumafu''. M'agbawa j'ajuo nnanna m whe kaa nfutara ya asi m l' obu kwa whe yara whe nkwu.

Whe Mmuta: O dighi otu eji dowa onu kpoo ''Owo'' onu l'agaghi ikafu akafu. Wh'ike la Wh'ike nji akwu. Uwa bu whe onye nkuru l'o g' ighoro. Juonu Nna anyi Polu la Ndi Galeshia 6:7 . Onye eligwe nkakwara ya la akwukwo Luku 6:38. Ndi k'anyi! anyi mmagharianu uro shigharia ishi. Onye ji mma (cutlass) gboto ya; t'anyi mgbawa nkwa. ''Kama onye mara ya nnyagha oku nnyaka m; m'adabalagha ya oku'' ; o bu okwu oma? I hakwaraghi ya oku kaa ,jee kwanwuo odo? I maala whe echi nwere ike i bu? A si m ''Onwa ohuu na mara anyi a l'ile nma ooooooo'' Amin!