Monday, December 17, 2012

TA ANYI NCHETAKWA NDE L'ODIGHI OTU OFOROLA WE L'EKERESHIMESI NANIA (Nneoma Chidi Onwudiwe)


Ụmụnnem, unu anọọ la yeh? A da'akwadola ekeresimesi! Ụbọchị eji echeta ọmụmụ onye nzọpụta anyi Jisos Krist. Aha Ya ọdọ nbụkwa Emmanuel. ( Onyenweanyi nọnyere anyi)

Ekperem l'ishi anyịalile mbụ ahụ ike, ọgalihu, nghọta, la ogologo ndu. Adikwam ịrọ udo l'etiti anyi la ikwu l'ibe anyi, ọgalihu la ọgbakọ Ngwa Gbururu na. Ma ada sịị ta Onye eligwe nọọnyere anyi l'njem l'ile anyi ngị mee la oge meemee na anyi nọọ l'ime ya. Adim ikpuchi anyi l'ọbara Jisos. Onye iro agaghi icheta anyi. Ọkporo nzọ ngi gara anyi werewere. Ụgwụ ọjọọ agaghi ịkpọ anyi. Onye nsọ ngị iburu anyi ụzọ ma kpekwara anyi azụ. Whe l'ile aka anyi'metụrụ gasịkwa ịga l'ihi. Chileke nara ekpere anyi ma gọziekwa ya l'aha Jisọs Krist bu onye nwe anyi, Amin.

Biniko, ta anyi nchetakwa ndi l'ọdighi otu ọfọrọ we. Onye ahadila nwanne ya.

Sunday, December 9, 2012

NTOKO ONWUMAFU, NTOKO ONWU MAFU ( onye ndere ya mbu; Magnus Chinemerem David)

Ese bu nkwa Nde Ngwa l'eji eku ma ''Onye Dimkpa'' nnwuo. Mgba nnannam ( Dick Dinneya) ndiira ndu ; o gwara m si ''Nwanwa m! Ese nkwuwalaghi ,d'ege ''nem-nem''(rythm) ya. O nofughi odo, otu dimkpa l'ala anyi anwuo, ekuo ''ese'' e ji eme ''okwukwu''( Unu amaala nu hwe m kagha) ya. Mgb' Opara dimkpa ya npuura ''eghu isi l'ama'' ya futa ,y'agba nkwa gahia nna l'ile(everywhere), gbawa jaa wuo ukwu l'ese. Whe mgbagwojurum anya mbu , la mgbe owuchara ukwu l'ese, kachaa wh'ike yara nna ya nmere; ndi ese akusuo nkwa odo. Unu amaala whe nkwaa ndagha '' ntoko onwu mafu.. ntoko onwumafu''. M'agbawa j'ajuo nnanna m whe kaa nfutara ya asi m l' obu kwa whe yara whe nkwu.

Whe Mmuta: O dighi otu eji dowa onu kpoo ''Owo'' onu l'agaghi ikafu akafu. Wh'ike la Wh'ike nji akwu. Uwa bu whe onye nkuru l'o g' ighoro. Juonu Nna anyi Polu la Ndi Galeshia 6:7 . Onye eligwe nkakwara ya la akwukwo Luku 6:38. Ndi k'anyi! anyi mmagharianu uro shigharia ishi. Onye ji mma (cutlass) gboto ya; t'anyi mgbawa nkwa. ''Kama onye mara ya nnyagha oku nnyaka m; m'adabalagha ya oku'' ; o bu okwu oma? I hakwaraghi ya oku kaa ,jee kwanwuo odo? I maala whe echi nwere ike i bu? A si m ''Onwa ohuu na mara anyi a l'ile nma ooooooo'' Amin!

Friday, October 26, 2012

ODINMA ALA NGWA


ODINMA ALA NGWA

Odidighinu nma madu inwe nkwa da akwa aka l’obi. Elele l’agba odo ogodo ya ada agba odo. Whe ji ogalihi Ala Ngwa…nde kwee, nde ekweghi.

Nde okemadu, mazinu! Umutakiri unu nnukwanu otu ole? Nnanna nsinu l’obu aguhie uzo aguhie onu. Ukam ndikasara Chileke l’isi anyi lile mbu ogalihi, ndu la udo.
Ala Ngwa mbu ala Obiligwe ngoziri. Maduwe nmetaranu voo nmuo di l’ala Ngwa abia deme yanula agwa ojoo ke anyi oga kariri ken de odowe. Ijula onwe gi ajuju si “Ngiri mere ogalihi obodowe nfutara ihie l’ala Ngwa njiri buru gaghi  ihu gaghi azu? Obu ngiri nkpatara aruru ala njiri mee nkari l’ala Ngwa? Ngiri nji ogalihi ala Ngwa?
Ala Ngwa nmwere Kansul ochichi obodo asaa l’ime iri la asaa ndi la steti Abia; Isiala Ngwa North, Isiala Ngwa South, Obingwa, Osisioma Ngwa, Ugwunagbo, Aba South lakwa Aba North. L’ime kansul ndinaniawo, enwere obodowe ndi nfura ihie dika, Aba, Omoba, Nbawsi, Owerrinta, Osisioma, Obegu, Mgboko, Okpuala Ngwa, Ugwunagbo.
NGIRI NMERE ANYI NJI GAGHI IBU EZE LA ABIA STETI?

Ahia ndewe kara aka dikwa l’ime Ala Ngwa dika; Ahia Ohuu, Ahia Ekeakpara, Orie Ntigha, Nkwonwelechi, Orie Abala, Afo Osukwu, Orie Amaorji, Ahia Ehere, Nkwo Ngwa, Orie Ndiolumbe, Nkwo Okpu, Ahia Ariaria, Nkwo Ebe, Ahia Eke Nbawsi Umuomianta. Ahia Umuoba.
OBU NGIRI NJI OGALIHI NDE NGWA?

Abiakwa la Ala Ngwa, odighi udi nde nwere ogugu isi, aka oru, nguru akwukwo, mkpatara ikpeghe yala mbara ogaranya ilagaghi ihu. 
NDIGHI WHE MBU NKPA ALA NGWA?

Amaralam ntuturu obodowe nji akawe tinyere onwewo oku eletirik, heta la mgbali la nmekorita umunne. Otutu mba ndikwa la ngwa ngbakatakwara aka zuo umuwe l’ulo akwukwo di elu mobukwa zigawe ala bekee, magbuowa whe ndewe aburula akuko ifo la Ala Ngwa.
UMUNNAA OBU NGIRI?

Anyi ngalata l’owu ndi ndorondo ochichi, anyi nwere ndewe gbara okpurukpu hietakwa la ntuala Ochichi onyekwuo uche ya keniania, anyi nwere nde dika Chief Dan Nwankwo, Dr Max Nduaguibe, Chief Chukwu Wachukwu, Dr G. Amuta, Sen. Enyinnaya Abaribe, Sen. Nkechi Nwaogu, Sen. Bob Nwanunu, Comrade Alozie Akomas, Chief Reagan Ufomba, Chief Eric Acho Nwakanma, Chief A.C.B Agbazuere, Chief Ahamdi Nweke, Dr C. C Okwuonu, Sir Tony Enwereuzor, Hon. Uzo Azubuike, Nwadiala Emeka Wogu, Chief Allen Nwachukwu, Apostle Rowland Nwosu, Dr Chris Nkwonta, Hon Prince Chris Enweremadu, Hon. Chinenye Ike, Dr Dan Imo, Hon Blessing Nwagba, Chief Simon Emeh, Prince Paul Ikonne, Chief Nyerere Anyim, Prof Ohiagu, l’otutu ndewe…
NDE K'ANYI OBU NGIRI NJI NKITA ONWU? "Let's go" abunughi ije otu onye!

Umunnam, bianu ta anyi nyuo koo mamiri onu t’ogbo ufufu. Onye la anoghi nda ji ya nji ahu l’akuku oku. M’onye Ngwa maara whe adighi nyugoro nyaa ugbo gomenti Abia Steti, ebe umunnaa nde ñujuru miri ara afo nga inyere ya aka, whe nji ogalihi anyi agabeghi iha ya.
Oha Ngwa nkwesiri itiya anya l’ala hofuta onye anyi lile nga ikwado la afo 2015 ma ndu di. Onye oha nsi hafu ta nwanne ya mputa uzo, ya echela l’emere ya whe ojoo, odikwa ebe ogwe ya ndigba nkpa ahu. Otu onye ejighi agba agba cheekwaa eche. Onye akatosila nwanneya. O budi oke mbi l’ulo ngwara ke bi l’ohia la azu ndi la mkpo. Ezeji Nwamgburuka ndila la Itungwa nsi “Onye da agba Politik ya gbafuo ke yala umunna ya nga iji ato”
Obulezi l’obu ndorondoro ochichi, onye obula nwekwara ike ido ya hetala ogbako Paati (Party) ya. Ma o gaiburu onye ahu whe nkocha ma oburu ya mbu ngwaoru nde Ohuhu nga iji tisasia nde Ngwa. Biko bia ala bie ekpere, onye emejoro gbaghara. Umunna mbu ike. Ta anyi nhafunu nkewa. Isi, obi, ugwu, aba whelile ahu mbu nnaa (Otu) Onye ngaje Abakiliki izuru uroshi futa la Aba huu uroshi, ya zuru Aba hafunu Kiliki. Onye obula kiiyira onwe ya ugwu…okariaa la! Odi unu ka nde ohuhu enweghi nkewa l’ime onwe we…odukwa la ndorondo ahu  wa apia anyi isi l’ala?

Odidighinu nma madu inwe nkwa da akwa aka l’obi. Elele l’agba odo ogodo ya ada agba odo. Umuokorobia la Umuagboghobia, ta anyi nlezie anya. Anyi nhafula la onye anyi nchoro mbu dedem, dede nnem, nwanne nnam, onye obeka anyi, ogom, onye onumara anyi ma lekwasa anya la; Nwokoa mobu Nwanyia, ogakwadi inyaghite mkpo? Onwekwara ezi agwa? Whe   ndachiri ya uvuru obukwadi odinma nde Abia Steti t’obu onya akpa eli ozu? Ma ulo adighi vuru aja, ntumaka ya agaghi ibe. Adighi onye l’amaghi lejighi azu nkita ohia ehi nta. Gbuowa mbu luzo.

Ndewonu!


Wednesday, August 22, 2012

ALA ANYI MBU NGWA

Kenania mbu otu amaraumunna ke nde Ngwa. Ala Ngwa mbu otu aburu nhiri nne la ala Igbo - Naijeria (Nigeria) Ngwa nmutara umu ato; UKWU, OHA la AVOSI. Ukwu mbu ya mbu opara Ngwa, nne nji ya la Oha. Avosi mbukwanu opara nwanyi ke nmere ya osota opara Ngwa.  Ala Ngwa nwere ala hienne. Ala Ngwa nwere iri l'ihi la ala anyi nji eme whe akoro mobu akuru l'oru eruo nne. Ala Anyi mbu Ngwa, otutu whe di iche iche di l'ime ya dika ; Nkwu, Aki, Oji la whe ndi odo. Ngwa nwere kansul ochichi obodo asaa la Steti Abia; Isiala Ngwa North, Isiala Ngwa South, Obingwa, Osisioma Ngwa, Ugwunagbo, Aba South la Aba North. Omelala Ngwa abughi whe madu nji ese abiri. Okwu Ngwa nfuru iche. Nde Ngwa abia burukwa ndi nwere mgbali ndi iche iche. Ala Ngwa nji eche ndi obia. Nde Ngwa nji abukwanu "ohuru obia gbawa nkwa"