Friday, October 26, 2012

ODINMA ALA NGWA


ODINMA ALA NGWA

Odidighinu nma madu inwe nkwa da akwa aka l’obi. Elele l’agba odo ogodo ya ada agba odo. Whe ji ogalihi Ala Ngwa…nde kwee, nde ekweghi.

Nde okemadu, mazinu! Umutakiri unu nnukwanu otu ole? Nnanna nsinu l’obu aguhie uzo aguhie onu. Ukam ndikasara Chileke l’isi anyi lile mbu ogalihi, ndu la udo.
Ala Ngwa mbu ala Obiligwe ngoziri. Maduwe nmetaranu voo nmuo di l’ala Ngwa abia deme yanula agwa ojoo ke anyi oga kariri ken de odowe. Ijula onwe gi ajuju si “Ngiri mere ogalihi obodowe nfutara ihie l’ala Ngwa njiri buru gaghi  ihu gaghi azu? Obu ngiri nkpatara aruru ala njiri mee nkari l’ala Ngwa? Ngiri nji ogalihi ala Ngwa?
Ala Ngwa nmwere Kansul ochichi obodo asaa l’ime iri la asaa ndi la steti Abia; Isiala Ngwa North, Isiala Ngwa South, Obingwa, Osisioma Ngwa, Ugwunagbo, Aba South lakwa Aba North. L’ime kansul ndinaniawo, enwere obodowe ndi nfura ihie dika, Aba, Omoba, Nbawsi, Owerrinta, Osisioma, Obegu, Mgboko, Okpuala Ngwa, Ugwunagbo.
NGIRI NMERE ANYI NJI GAGHI IBU EZE LA ABIA STETI?

Ahia ndewe kara aka dikwa l’ime Ala Ngwa dika; Ahia Ohuu, Ahia Ekeakpara, Orie Ntigha, Nkwonwelechi, Orie Abala, Afo Osukwu, Orie Amaorji, Ahia Ehere, Nkwo Ngwa, Orie Ndiolumbe, Nkwo Okpu, Ahia Ariaria, Nkwo Ebe, Ahia Eke Nbawsi Umuomianta. Ahia Umuoba.
OBU NGIRI NJI OGALIHI NDE NGWA?

Abiakwa la Ala Ngwa, odighi udi nde nwere ogugu isi, aka oru, nguru akwukwo, mkpatara ikpeghe yala mbara ogaranya ilagaghi ihu. 
NDIGHI WHE MBU NKPA ALA NGWA?

Amaralam ntuturu obodowe nji akawe tinyere onwewo oku eletirik, heta la mgbali la nmekorita umunne. Otutu mba ndikwa la ngwa ngbakatakwara aka zuo umuwe l’ulo akwukwo di elu mobukwa zigawe ala bekee, magbuowa whe ndewe aburula akuko ifo la Ala Ngwa.
UMUNNAA OBU NGIRI?

Anyi ngalata l’owu ndi ndorondo ochichi, anyi nwere ndewe gbara okpurukpu hietakwa la ntuala Ochichi onyekwuo uche ya keniania, anyi nwere nde dika Chief Dan Nwankwo, Dr Max Nduaguibe, Chief Chukwu Wachukwu, Dr G. Amuta, Sen. Enyinnaya Abaribe, Sen. Nkechi Nwaogu, Sen. Bob Nwanunu, Comrade Alozie Akomas, Chief Reagan Ufomba, Chief Eric Acho Nwakanma, Chief A.C.B Agbazuere, Chief Ahamdi Nweke, Dr C. C Okwuonu, Sir Tony Enwereuzor, Hon. Uzo Azubuike, Nwadiala Emeka Wogu, Chief Allen Nwachukwu, Apostle Rowland Nwosu, Dr Chris Nkwonta, Hon Prince Chris Enweremadu, Hon. Chinenye Ike, Dr Dan Imo, Hon Blessing Nwagba, Chief Simon Emeh, Prince Paul Ikonne, Chief Nyerere Anyim, Prof Ohiagu, l’otutu ndewe…
NDE K'ANYI OBU NGIRI NJI NKITA ONWU? "Let's go" abunughi ije otu onye!

Umunnam, bianu ta anyi nyuo koo mamiri onu t’ogbo ufufu. Onye la anoghi nda ji ya nji ahu l’akuku oku. M’onye Ngwa maara whe adighi nyugoro nyaa ugbo gomenti Abia Steti, ebe umunnaa nde ñujuru miri ara afo nga inyere ya aka, whe nji ogalihi anyi agabeghi iha ya.
Oha Ngwa nkwesiri itiya anya l’ala hofuta onye anyi lile nga ikwado la afo 2015 ma ndu di. Onye oha nsi hafu ta nwanne ya mputa uzo, ya echela l’emere ya whe ojoo, odikwa ebe ogwe ya ndigba nkpa ahu. Otu onye ejighi agba agba cheekwaa eche. Onye akatosila nwanneya. O budi oke mbi l’ulo ngwara ke bi l’ohia la azu ndi la mkpo. Ezeji Nwamgburuka ndila la Itungwa nsi “Onye da agba Politik ya gbafuo ke yala umunna ya nga iji ato”
Obulezi l’obu ndorondoro ochichi, onye obula nwekwara ike ido ya hetala ogbako Paati (Party) ya. Ma o gaiburu onye ahu whe nkocha ma oburu ya mbu ngwaoru nde Ohuhu nga iji tisasia nde Ngwa. Biko bia ala bie ekpere, onye emejoro gbaghara. Umunna mbu ike. Ta anyi nhafunu nkewa. Isi, obi, ugwu, aba whelile ahu mbu nnaa (Otu) Onye ngaje Abakiliki izuru uroshi futa la Aba huu uroshi, ya zuru Aba hafunu Kiliki. Onye obula kiiyira onwe ya ugwu…okariaa la! Odi unu ka nde ohuhu enweghi nkewa l’ime onwe we…odukwa la ndorondo ahu  wa apia anyi isi l’ala?

Odidighinu nma madu inwe nkwa da akwa aka l’obi. Elele l’agba odo ogodo ya ada agba odo. Umuokorobia la Umuagboghobia, ta anyi nlezie anya. Anyi nhafula la onye anyi nchoro mbu dedem, dede nnem, nwanne nnam, onye obeka anyi, ogom, onye onumara anyi ma lekwasa anya la; Nwokoa mobu Nwanyia, ogakwadi inyaghite mkpo? Onwekwara ezi agwa? Whe   ndachiri ya uvuru obukwadi odinma nde Abia Steti t’obu onya akpa eli ozu? Ma ulo adighi vuru aja, ntumaka ya agaghi ibe. Adighi onye l’amaghi lejighi azu nkita ohia ehi nta. Gbuowa mbu luzo.

Ndewonu!


1 comment:

  1. Ala Ngwa ga adi. Ala Igbo ga adi. Ekelee m unu umunne m ndi Ngwa, a bu m onye Abba, nke di na Nwangele. Ahurum Igbo nile n'anya. Ya gaziere anyi.

    ReplyDelete