Sunday, May 12, 2013

ỤWAEZUOKE - Kelechi Amucha

Nma dị nkọ adịị ishi, ke ndị ishi adịị nkọ. Ọdịị whe ngwụrụ madụ ike ọrụ mọbụkwanụ daa onyeahụ umengwụ dịka ngwọrụ ọjọọ. Okomadụ nwanyị nwere onye nlewa ya nka nsị l’abụrụwe nnwe nka. Ọdịịnụgh nma Elele nda agba ọdọ, ọgọdọ ya ada agba ọdọ. Onye ishinkwọcha adịị nma ịga ọgụ ejinụ ishi alụ. Nwanyị ọjọọ mọbụkwa nwoko ọjọọ mbụ agba ekperechi. 

Omere nwoko ncheta obi awịya lafọ mọbụkwanụ ikowa nwanyị obi l’elu l’ụtụtụ, ikoto lakwa l’abalị, wheawo mbụchaa aka ọrụ ịlụta nwanyị mọbụ nwoko ọjọọ. Amaralam lọdịị nwoko ndị nsọ yala nwanyị mbụ onye mụọ ozi, amakwaralam la Ụwaezuoke, ma arịrịom mbụ onye lile nwụrụ nwankịta ya nwụnye l’akpa. Nwoko mbịara kwụọ ụgwọ ishi gi abụghụ eghu mọbụkwanụ nwanyi nkwere gị di abụghụ ohu. 

Nwanyị ọjọọ mbụ ọrịa afọ. Ịlụta ya yebido nsogbu, ojighi akwụshị ọgwụla ma ogburugh mọbụkwanụ gwọfụ ya. Nwoko ọjọọ mbụkwa ikere mbere nṅaa ọjọọ, adịghị eji ike egbu ya. 

Alụm dilanwunye ndịkwanụ ụtọ ma nghọta dihala lagbata nwoko la nwanyị ya. Ọghakishiala, oji enye nsogbu la nkwuchikalata. Ụwaezuoke. 

No comments:

Post a Comment